Isaiah 60

Ebube nke Zayọn

1“Bilie, mụkee, nʼihi na ìhè gị abịala,
ebube Onyenwe anyị awaakwala nʼahụ gị dịka anyanwụ.
2Lee, ọchịchịrị na-ekpuchi ụwa niile,
oke ọchịchịrị na-ekpuchi ndị niile bi nʼụwa,
ma Onyenwe anyị ga-awa dịka anyanwụ nʼahụ gị
ebube ya ga-achakwa ka ihe nʼebe i nọ.
3Mba niile dị iche iche ga-abịakwute ìhè gị,
ndị eze niile ga-abịaru mmụke nke ọwụwa gị.

4“Welienụ anya unu abụọ elu legharịa gburugburu unu,
ha niile na-ezukọta na-abịakwute gị;
ụmụ gị ndị ikom na-esi nʼebe dị anya bịa,
ụmụ gị ndị inyom ka a ga-ekukwa nʼụkwụ.
5Mgbe ahụ, ị ga-elepụ anya ma chakee,
obi gị ga-atọ gị ụtọ, saa mbara nʼihi ọṅụ,
nʼihi na akụ niile nke osimiri ka a ga-ewebatara gị,
akụnụba nke ọtụtụ mba ga-abịara gị.
6Ọtụtụ igwe ịnyịnya kamel nke si Midia
na Efaa ga-ejupụta nʼala gị,
Ndị ebo Midia, bụ ndị sitere nʼakụkụ ndịda ọdịda anyanwụ osimiri Jọdan. Ha na-achị anụ ụlọ na-agagharị nʼihi izu ha. Efaa bụ nwa nwoke Midian Jen 25:4.

ma ndị sikwa nʼobodo Sheba
ga-ebutere gị ọlaedo na ụda na-esi isi ụtọ.
Ha ga-ekwusakwa otuto Onyenwe anyị.
7A ga-enye gị igwe ewu na atụrụ niile nke ndị Keda.
Ebule niile nke Nebaiot ga-abụ nke gị.
A ga-anabata ha dịka onyinye nʼelu ebe ịchụ aja m.
Aga m edozi ụlọnsọ m dị ebube, mee ya ka ọ maa mma karịa.

8“Olee ndị bụ ndị a na-efegharị dịka igwe ojii,
ndị na-efegharị dịka ụmụ nduru na-efeba nʼakwụ ha?
9Nʼezie, mụ ka ala ndị ahụ mmiri gbara gburugburu na-echere;
ụgbọ niile nke Tashish ga-ebukwa ụzọ,
na-ebughachi ụmụ gị site nʼebe dị anya,
ha na ọlaọcha na ọlaedo ha niile.
Inye Onyenwe anyị bụ Chineke gị nsọpụrụ,
Onye nsọ nke Izrel,
nʼihi na ọ jirila ịma mma gọzie gị.


10“Ndị mba ọzọ ga-abịa wuziere unu mgbidi unu niile.
Ndị na-achị achị na ndị eze ha niile ga-ejere unu ozi.
Ọ bụ ezie na m tikpọrọ gị nʼiwe m,
ma site nʼamara m, aga m emere gị ebere.
11Ọnụ ụzọ ama gị ga-eghe oghe oge niile
site nʼụtụtụ ruo nʼụtụtụ,
ịnabata akụ niile si na mba dị iche iche.
A ga-edurukwa ndị eze dị iche iche bata nʼime ya nʼọnọdụ ndị a dọtara nʼagha.
12Mba ọbụla jụrụ ijere gị ozi ga-ala nʼiyi;
a ga-ekpochapụ ha.

13“Otuto niile na ịma mma niile nke Lebanọn ga-abụ nke gị.
Osisi junipa, na osisi fịa, na osisi junipa, na osisi saipres,
ka a ga-eji chọọ ụlọnsọ m mma.
Aga m emekwa ka ebube jupụta nʼebe ahụ ụkwụ m na-adị mgbe niile.
14Ụmụ ndị na-emegbu gị ga-abịa kpọọ isiala nye gị.
Ndị ahụ niile na-elelị gị ga-abịa daa nʼala nʼihu gị sutu ụkwụ gị ọnụ.
Ha ga-akpọ Jerusalem, Obodo Onyenwe anyị,
Zayọn nke Onye nsọ Izrel.

15“Ọ bụ ezie na ọ dị mgbe ị bụ onye a kpọrọ asị, onye a na-emegbu,
onye mmadụ niile na-eweda nʼala,
ma ugbu a, ị ga-ama mma ruo ebighị ebi;
ị ga-abụ ihe na-ewetara ọgbọ niile nke ụwa ọṅụ, nʼihi na otu a ka m ga-eme gị.
16Ị ga-aṅụ mmiri ara nke mba dị iche iche,
ọ bụkwa ara ndị eze ka a ga-eji zuo gị.
Ọ bụkwa ara ndị eze ka ị ga-amị

Mgbe ahụ, ị ga-amata nʼezie na mụ onwe m, bụ Onyenwe anyị bụ Onye nzọpụta gị
na Onye mgbapụta gị, Onye dị ike nke Jekọb.
17Nʼọnọdụ bronz, aga m eweta ọlaedo,
nʼọnọdụ igwe aga m eweta ọlaọcha.
Nʼọnọdụ osisi, ọ ga-abụ ọla,
nʼọnọdụ nkume, ọ ga-abụ igwe.
M ga-eme ka udo bụrụ ndị nlekọta gị
ezi omume ga-abụ onye na-achị gị.
18Ihe ike agaghị adịkwa nʼala gị ọzọ.
Agha niile ga-akwụsị, mbibi na ịla nʼiyi agaghị adịkwa.
Mgbidi gị ga-aghọ Nzọpụta,
ị ga-akpọkwa ọnụ ụzọ ama gị niile Otuto.
19Anyanwụ agaghị abụkwara gị ìhè nʼehihie ọzọ,
maọbụ maramara nke ọnwa amụkwasị gị ihe,
nʼihi na Onyenwe anyị Chineke gị ga-abụrụ gị ìhè ruo ebighị ebi,
Chineke gị ga-abụkwa ebube gị.
20Anwụ gị agaghị ada ada,
ọnwa gị agaghị akwụsịkwa ịcha;
nʼihi na Onyenwe anyị ga-abụrụ gị ìhè ụbọchị gị niile,
iru ụjụ gị niile ga-agabigakwa.
21Mgbe ahụ, ndị gị niile ga-abụ ndị ezi omume,
ha ga-enwetakwa ala ahụ ruo ebighị ebi.
Ha bụ ome nke m kụrụ,
bụ ọrụ aka m,
ime ka ịma mma m pụta ìhè.
22Ezinaụlọ dị nta ga-aba ụba ghọọ obodo,
mba nta ga-aghọ obodo buru ibu.
Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị,
ga-eme ka ha niile mezuo ọsịịsọ nʼoge ya.”
Copyright information for IboBIU